Luk 1

O gosila ike aka ya; ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha.

Luke 1:51 (UKJV) He has showed strength with his arm; he has scattered the proud in the imagination of their hearts.

49Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ.

50Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

51O gosila ike aka ya; ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha.

52O sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu.

53O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.