54O nyerela odibo ya bụ Izrel aka, ọ na-echetakwa imere ya ebere.
55Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”
56Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.
57Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke.
58Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ.