57Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke.
58Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ.
59Nʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya,
60ma Nne ya sịrị, “Mba, a ga-agụ ya Jọn.”
61Ha sịrị ya, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ndị ikwu gị na-aza aha ahụ.”