65Ibubo wụrụ ndị agbataobi ha niile nʼahụ, ndị mmadụ kọkwara akụkọ banyere ihe ndị a niile ruo obodo niile dị nʼakụkụ ugwu Judịa.
66Ndị niile nụrụ akụkọ a chere nʼobi ha na-ajụ sị, “Gịnịkwa ka nwa nke a gaje ịbụ?” Nʼihi na aka Onyenwe anyị dịnyeere ya.
67E mere ka Zekaraya bụ nna ya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma sị,
68“Ngọzị dịrị Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, nʼihi na ọ bịala leta ma gbapụtakwa ndị nke ya.
69O welielara anyị Onye nzọpụta site nʼụlọ odibo ya bụ Devid.