71Na ọ ga-azọpụta anyị site nʼaka ndị iro anyị na sitekwa nʼaka ndị niile kpọrọ anyị asị.
72O meere ndị nna nna anyị ha ebere site nʼicheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ.
73Iyi nke ọ ṅụụrụ nna anyị bụ Ebraham, kwekwa nkwa:
74Na ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, nyekwa anyị ike ife ya ofufe na-atụghị egwu.
75Nʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị.