76“Ma gị nwa m, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye kachasị ihe niile elu; nʼihi na ị ga-aga nʼihu Onyenwe anyị kwadoro ya ụzọ.
77Ime ka ndị nke ya nwee amamihe nke nzọpụta site na ịgbaghara mmehie ha.
78Nʼihi oke obi ebere Chineke anyị, nke ọwụwa anyanwụ ga-ewetara anyị site nʼigwe.
79Ka ọ chakwasị ndị bi nʼọchịchịrị na nʼonyinyo nke ọnwụ, na iduzi ụkwụ anyị nʼụzọ nke udo.”
80Nwata ahụ toro, bụrụ onye dị ike nʼime mmụọ. O biri nʼime ọzara tutu ruo mgbe oge zuru igosi ụmụ Izrel onwe ya.