Luk 10

Ọ ga-akara Taịa na Saịdọn mma nʼụbọchị ikpe karịa unu.

Luke 10:14 (UKJV) But it shall be more tolerable for Tyre and Sidon at the judgment, than for you.

12Ana m agwa unu na nʼụbọchị ahụ, ga-akara Sọdọm mma karịa obodo ahụ.

13“Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịrị gị Betsaida. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ebube a rụrụ nʼime unu ka a rụrụ na Taịa na Saịdọn ha gaara echegharị ogologo oge, nọdụ nʼakwa mkpe na ntụ.

14Ọ ga-akara Taịa na Saịdọn mma nʼụbọchị ikpe karịa unu.

15Ma gị Kapanọm! Ị na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịda nʼala mmụọ!

16“Onye ọbụla gere unu ntị, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọbụla jụrụ ịnabata unu, ọ bụ mụ ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọbụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata onye zitere m.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.