Luk 10

Ọ sịrị ya, “Gịnị ka e dere nʼiwu? Gịnị ka ị gụtara nʼime ya?”

Luke 10:26 (UKJV) He said unto him, What is written in the law? how read you?

24Ana m asị unu, na ọtụtụ ndị amụma na ndị eze ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya.”

25Otu ụbọchị, otu onye ozizi iwu biliri ịnwale ya. Ọ jụrụ ya, “Onye ozizi, gịnị ka m kwesiri ime ka m keta ndụ ebighị ebi?”

26Ọ sịrị ya, “Gịnị ka e dere nʼiwu? Gịnị ka ị gụtara nʼime ya?”

27Ọ zara sị, “ ‘Ị ga-eji obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na ike gị niile, na uche gị niile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya’; ma ‘hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’”

28Ọ sịrị ya, “Ị zara nke ọma. Gaa mee nke a ị ga-adị ndụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.