Luk 10

Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nʼebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke adịla unu nso.’

Luke 10:9 (UKJV) And heal the sick that are therein, and say unto them, The kingdom of God has come nigh unto you.

7Nọgidenụ nʼebe ahụ, na-erinụ ma na-aṅụkwanụ ihe ọbụla ha nyere unu, nʼihi na onye ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya. Unu esitela nʼotu ụlọ gaa nʼụlọ ọzọ.

8“Ọ bụrụ na ndị bi nʼobodo unu batara anabata unu, rienụ ihe ọbụla ha nyere unu.

9Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nʼebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke adịla unu nso.’

10Ma mgbe unu banyere nʼobodo ọbụla ha jụ ịnabata unu, pụọnụ gaa nʼokporoụzọ ya kwuo sị,

11‘Ọ bụladị aja si nʼobodo a nke nyapagidere nʼụkwụ anyị, anyị na-ehichapụ ya ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka ntị nye gị. Otu ọ dị, matakwanụ nke a, na alaeze Chineke dị nso.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.