33“Ọ dịghị onye na-amụnye oriọna dọnye ya nʼebe zoro ezo maọbụ nʼokpuru efere, kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ.
34Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụ na anya gị dị mma, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè. Ọ bụrụkwanụ na anya gị dị njọ, ị ga-anọ nʼọchịchịrị.
35Ya mere, lezie anya ka ị mara ka ìhè dị nʼime gị, ọ bụghị ọchịchịrị.
36Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ahụ gị niile ejupụta nʼìhè, ọ bụrụkwa na akụkụ ọbụla agbaghị ọchịchịrị, mgbe ahụ, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè dị ka mgbe ìhè oriọna na-achakwasị gị nʼahụ.”
37Mgbe ọ na-ekwu okwu, otu onye Farisii kpọrọ ya ka ọ bịa soro ya rie nri. Ọ banyere nọrọ nʼoche nri.