Luk 12

“Gịnị mere unu adịghị ekpebiri onwe unu ihe ziri ezi?

Luke 12:57 (UKJV) Yea, and why even of yourselves judge all of you not what is right?

55Mgbe unu hụrụ na ifufe na-esite na ndịda na-efe, unu na-asị, Oke okpomọkụ ga-adị, ọ na-emekwa otu ahụ.

56Ndị ihu abụọ! Unu matara ịkọwa ihu ala na mbara eluigwe. Gịnị mere unu apụghị ịkọwa oge dị ugbu a?

57“Gịnị mere unu adịghị ekpebiri onwe unu ihe ziri ezi?

58Ọ bụrụ na gị na onye na-ebo gị ebubo esoro na-aga nʼihu ọkaikpe, gbalịsie ike ka gị na ya kpezie nʼụzọ, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-akpọpụ gị nʼihu onye ọkaikpe, ma eleghị anya ọkaikpe ahụ ga-arara gị nye nʼaka ọkaikpe ukwu, ọkaikpe ukwu ga-ararakwa gị nye nʼaka onye na-eje ozi nʼụlọikpe, bụ onye ga-etinye gị nʼụlọ mkpọrọ.

59Asị m gị, ị gaghị e si nʼebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụghachiri ọ bụladị otu kobo nke ikpeazụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.