15Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Unu ndị ihu abụọ! Ọ dị onye nʼime unu na-adịghị atọpụ oke ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, site nʼụlọ anụmanụ, kpụpụ ya ebe ọ ga-aṅụ mmiri nʼụbọchị izuike?
16O kwesighị ka a tọpụ nwanyị a bụ ada Ebraham nʼagbụ ekwensu kere ya ogologo afọ iri na asatọ, nʼụbọchị izuike, mee ka o nwere onwe ya?”
17Mgbe o kwuru nke a, ihere mere ndị iro ya niile, ma ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọrụ ebube niile ọ na-arụ.
18Ya mere, ọ na-ekwu sị, “Gịnị ka alaeze Chineke yiri? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya?
19O yiri mkpụrụ mọstaadị nke mmadụ kụrụ nʼubi ya a gbara ogige. O toro ghọọ osisi, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.”