24“Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike.
25Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’
26“Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’
27“Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’
28“Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi.