1Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ gwara ya banyere ndị Galili ahụ Pailet jiri ọbara ha gwakọta nʼaja ha chụrụ.
2Ọ zara sị ha, “Unu chere na ndị Galili a tara ụdị ahụhụ a bụ ndị mmehie karịa ndị Galili niile?
3Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-esi otu ahụ laa nʼiyi.
4Ka unu chere na mmadụ iri na asatọ ahụ, ndị mgbidi aja ụlọ elu Sailọm dagburu bụ ndị ikpe mmehie mara karịa ndị niile bi na Jerusalem?
5Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-ala nʼiyi dị ka ha.”