32Ọ sịrị ha, “Gaa gwaranụ m nkịta ọhịa ahụ, lee, ana m achụpụ mmụọ ọjọọ, gwọọkwa ndị ọrịa taa na echi, ma nʼụbọchị nke atọ ka m ga-arụcha ọrụ m.
33Ma otu ọ dị, aga m aga nʼihu nʼụzọ m taa, na echi na nwanne echi, nʼihi na nʼezie, ọ dịghị onye amụma ga-anwụ nʼebe ọzọ na-abụghị na Jerusalem.
34“O Jerusalem! Jerusalem! Gị onye na-egbu ndị amụma ma na-ejikwa nkume atụgbu ndị e ziteere gị. Ọtụtụ mgbe ka m gbalịrị ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ sị achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya, ma unu ekweghị.
35Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu. Ma agwa m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ ruo mgbe oge ahụ ga-abịa, mgbe unu ga-asị, ‘Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.’ ”