6Ya mere, ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu nwoke kụrụ osisi fiig nʼubi vaịnị ya, ma mgbe ọ bịara chọọ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla.
7Ya mere, ọ gwara onye ọrụ ubi ya sị, ‘Nʼime afọ atọ ndị a ka m bịara ka m ghọrọ mkpụrụ site nʼosisi fiig a, ma ahụghị m mkpụrụ ọbụla. Gbutuo ya! Gịnị mere ọ ga-eji na-erikọ nri dị nʼala ubi a?’
8“Ọ zara sị ya, ‘Nna m ukwu, hapụkwa ya nʼafọ a, ka m gwuo ala gburugburu, hinye ya aja nri ala nʼukwu.
9Ọ bụrụ na ọ mịa mkpụrụ nʼafọ ọzọ, ọ dị mma, ọ bụrụkwa na ọ mịghị, i nwere ike gbutuo ya. ’ ”
10Nʼụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe.