10Ma mgbe a kpọrọ gị, nọdụ nʼoche dị ala, ka ọ ga-abụ na onye kpọrọ gị oriri bịa, ọ ga-asị gị ‘Enyi m, rigota nʼebe a ka elu.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwekwa ugwu nʼanya ndị niile a kpọrọ gị na ha oriri.
11Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”
12Ọ gwara onye ahụ kpọrọ ya oriri sị, “Mgbe ị na-akpọ oriri nke nri ehihie maọbụ nke nri anyasị, akpọla naanị ndị enyi gị maọbụ ụmụnne gị ndị nwoke maọbụ ndị ikwu na ibe gị, maọbụ ndị agbataobi gị bara ọgaranya, nʼihi ma eleghị anya, ha pụrụ ịkpọkwa gị na mgbe nke ha, sị otu a kwụghachi gị ụgwọ.
13Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye na ndị ọlụsị na ndị ngwụrọ na ndị ìsì.
14A ga-agọzikwa gị, nʼihi na ha enweghị ike ịkwụghachi gị, a ga-akwụghachikwa gị mgbe ndị ezi omume ga-ebili nʼọnwụ.”