1Otu ụbọchị izuike, mgbe ọ gara iri ihe nʼụlọ otu onyendu ndị Farisii, ha nọ na-ele ya anya nke ọma.
2Ma lee, otu nwoke ahụ ya zara aza nọkwa nʼihu ya ebe ahụ.
3Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ ọrịa nʼụbọchị izuike ka ọ bụ na o zighị?”
4Ma ha e kwughị okwu ọbụla. Ya mere ọ kpọrọ ya, gwọọ ya ma sị ya laa.