24Nʼihi na agwa m unu, ọ dịghị otu onye nʼime ndị ahụ a kpọrọ oriri ga-edetụ nri m ọnụ.’ ”
25Ugbu a, oke igwe mmadụ na-eso ya ma ọ tụgharịrị sị ha:
26“Onye ọbụla chọrọ iso m, ma o bụghị ụzọ kpọ nne na nna ya, na nwunye ya, na ụmụ ya, na ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị tinyekwara ndụ nke ya onwe ya asị, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.
27Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, enweghị ike ịbụ onye na-eso ụzọ m.
28“Ọ dị onye ọbụla nʼime unu chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, gbakọọ ihe ọ ga-efu ya, iji chọpụta ma o nwekwara ego ga-ezu iwucha ya?