7Mgbe ọ hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri si họrọ naanị oche ndị a na-asọpụrụ, oche ndị a na-asọpụrụ, ọ tụrụ ha ilu sị,
8“Mgbe mmadụ ọbụla kpọrọ gị oriri nʼọlụlụ di na nwunye, abatala nọdụ nʼoche ndị a na-asọpụrụ, nʼihi na eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara onye ka gị nwe nsọpụrụ.
9Nʼihi na onye ahụ kpọrọ unu oriri nwere ike bịakwute gị sị gị, nye nwoke a ọnọdụ gị. Mgbe ahụ, ị ga-ebili nʼanya ihere gaa nọdụ nʼoche dịkarịsịrị ala.
10Ma mgbe a kpọrọ gị, nọdụ nʼoche dị ala, ka ọ ga-abụ na onye kpọrọ gị oriri bịa, ọ ga-asị gị ‘Enyi m, rigota nʼebe a ka elu.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwekwa ugwu nʼanya ndị niile a kpọrọ gị na ha oriri.
11Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”