8“Maọbụ olee nwanyị nke nwere mkpụrụ ọlaọcha iri, ọ bụrụ nʼotu nʼime ha adafuo. Ọ gaghị amụnye oriọna, zaa ime ụlọ ya ịchọ otu mkpụrụ ego ahụ tutu ọ chọta ya?
9Mgbe ọ chọtara otu mkpụrụ ego ahụ, ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m ego m furu efu.’
10Nʼụzọ dị otu a, asị m unu, ọṅụ ga-adị nʼihu ndị mmụọ ozi Chineke nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị.”
11O kwukwaara sị, “Otu nwoke mụtara ụmụ nwoke abụọ.
12Nwa ya nke nta sịrị nna ya, ‘Nna, kenye m oke ruuru m nʼihe niile i nwere.’ Ya mere, o kenyere ya oke nke ya site nʼihe o nwere.