2Ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-asị, “Nwoke a na-anabata ndị mmehie sorokwa ha na-eri nri.”
3Ya mere, ọ tụrụ ha ilu a sị,
4“Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu enwee narị atụrụ ma otu nʼime ha akpafuo. Ọ bụ na ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu ahụ fọdụrụ nʼọzara, pụọ ịchọgharị otu ahụ kpafuru ruo mgbe ọ chọtara ya?
5Mgbe ọ chọtara ya, ọ ga-eji ọṅụ tụkwasị ya nʼubu ya.
6Mgbe ọ lọtara nʼụlọ ya, ọ ga-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m atụrụ m furu efu.’