10“Onye ọbụla kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, ga-ekwesikwa ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu. Onye na-ekwesikwaghị ntụkwasị obi nʼihe dị ntakịrị, agaghịkwa ekwesi ntụkwasị obi nʼihe dị ukwuu.
11Ọ bụrụ na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ mmehie nke ụwa, onye ga-enyekwa ezi akụ nʼaka unu na ntụkwasị obi idebe?
12Ọ bụrụkwa na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ onye ọzọ, onye ga-enye unu ihe nke bụ nke unu?
13“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ, sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.”
14Mgbe ndị Farisii, bụ ndị hụrụ ego nʼanya nụrụ ihe ndị a, ha jiri ya mee ihe ọchị.