Luk 18

“Asị m unu, na nwoke a lara nʼụlọ ya bụrụ onye a gụrụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke karịa onye nke ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”

Luke 18:14 (UKJV) I tell you, this man went down to his house justified rather than the other: for every one that exalts himself shall be brought low; and he that humbles himself shall be exalted.

12Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ nʼizu ụka ọbụla. Ana m akwụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’

13“Ma onye ọna ụtụ ahụ guzo nʼebe dị anya, o nwekwaghị ike iweli ihu ya elu lee anya nʼeluigwe. Kama, ọ na-eti aka nʼobi ya na mwute na-asị, ‘Chineke, biko mere m ebere nʼihi na abụ m onye mmehie.’

14“Asị m unu, na nwoke a lara nʼụlọ ya bụrụ onye a gụrụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke karịa onye nke ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”

15Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha baara ha mba.

16Ma Jisọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya, sị, “Kweenụ ka ha bịakwute m, unu egbochikwala ha, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị ka ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.