22Mgbe Jisọs nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Otu ihe fọdụrụ ka ime: ree ihe niile i nwere, kesara ụmụ ogbenye ego ya. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, bịazie soro m.”
23Mgbe ọ nụrụ nke a, o wutere ya nke ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye nwere ọtụtụ akụ.
24Jisọs lere ya anya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe siri ike bụ ndị ọgaranya ịba nʼalaeze Chineke.
25Nʼezie, ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.”
26Ndị nụrụ ya sịrị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”