2ọ sịrị, “O nwere otu ọkaikpe bi nʼotu obodo ma ọ naghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị asọpụkwara mmadụ.
3Nʼobodo ahụkwa, e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ nke na-abịakwute ya, na-asị ya, ‘Kpepụta m nʼaka ndị na-emegide m.’
4“Na mmalite, ọ chọghị, ma nʼikpeazụ, ọ gwara onwe ya sị, ‘Ọ bụ eziokwu na anaghị m atụ egwu Chineke maọbụ sọpụrụ mmadụ.
5Ma nʼihi na nwanyị a di ya nwụrụ anwụ nọgidere na-enye m nsogbu, aga m ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka ọ kwụsị inye m nsogbu site na ọbịbịa ọ na-abịa.’ ”
6Ya mere Onyenwe anyị sịrị, “Gerenụ ihe ọkaikpe nke na-eme ajọ omume na-ekwu.