8Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, “Lee, Onyenwe anyị, aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile m nwere. Ọ bụrụkwa na o nwere onye m ghọgburu nara ya ihe ọbụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.”
9Jisọs gwara ya, “Taa nzọpụta abịala nʼụlọ a, nʼihi na onye a bụkwa nwa Ebraham.
10Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu.”
11Dị ka ha na-ege ya ntị nʼokwu a, ọ gara nʼihu tụọrọ ha ilu, nʼihi na ọ nọ Jerusalem nso, ha chekwara na o ruola mgbe alaeze Chineke ga-apụta ihe.
12Ọ sịrị, “Otu nwoke a mụrụ nʼọnọdụ dị elu gara obodo dị anya ka echie ya eze, ka ọ lọtakwa ma e mesịa.