13Ya mere, ọ kpọrọ ndị ohu ya iri nye ha mkpụrụ ego iri sị ha, ‘Werenụ ego ndị a zụọ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’
14“Ma ndị ọ na-achị kpọrọ ya asị, ha zipụkwara ndị ụkwụ ozi nʼazụ ya na-asị, ‘Anyị achọkwaghị ka onye a chịa anyị.’
15“Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru.
16“Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’
17“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’