16“Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’
17“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’
18“Onye nke abụọ bịara sịkwa, ‘Onyenwe m, otu mkpụrụ ego gị amụtala mkpụrụ ego ise ọzọ.’
19“Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’
20“Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya.