19“Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’
20“Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya.
21Atụrụ m egwu gị, nʼihi na ị bụ onye afọ tara mmiri, bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’
22“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ okwu si gị nʼọnụ ka m ga-eji kpee gị ikpe, gị bụ ohu ọjọọ! I maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị?
23Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’