23Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’
24“Mgbe ahụ, ọ gwara ndị guzo nʼebe ahụ, ‘Napụtanụ ya mkpụrụ ego ahụ, were ya nye onye ji mkpụrụ ego iri.’
25“Ha sịrị ya, ‘Nna anyị ukwu, o nwelarị mkpụrụ ego iri.’
26“Ọ zara, ‘Asị m unu, onye ọbụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere.
27Ma ndị iro m ahụ, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụpụtanụ ha nʼebe a, gbukwaanụ ha nʼihu m.’ ”