Luk 19

Ya mere, ọ gbaara ọsọ gaa nʼihu rigoro nʼotu osisi sikamọ, ka o nwee ike ịhụ ya dị ka ọ na-agafe nʼụzọ ahụ.

Luke 19:4 (UKJV) And he ran before, and climbed up into a sycomore tree to see him: for he was to pass that way.

2Otu nwoke nọ ebe ahụ, aha ya bụ Zakịọs; ọ bụ onyeisi ndị ọna ụtụ bụrụkwa ọgaranya.

3Ọ chọrọ ịhụ onye Jisọs bụ ma ebe ọ bụ onye mkpụmkpụ, ọ dịrịghị ya mfe nʼihi igwe mmadụ.

4Ya mere, ọ gbaara ọsọ gaa nʼihu rigoro nʼotu osisi sikamọ, ka o nwee ike ịhụ ya dị ka ọ na-agafe nʼụzọ ahụ.

5Mgbe Jisọs rutere nʼebe ahụ, o lere anya nʼelu sị ya, “Zakịọs, rịdata ngwangwa. Aga m abụ ọbịa nʼụlọ gị taa.”

6Ọ rịdatara nʼotu mgbe ahụ jirikwa obi ụtọ nabata ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.