9Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtara ihe nye ha. Ebube Onyenwe anyị mụwara gburugburu ha, oke egwu tụrụ ha.
10Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ana m ewetara unu oziọma nke oke ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ niile.
11Nʼihi na taa, nʼobodo Devid ka a mụrụ Onye nzọpụta nye unu; ọ bụ Kraịst, Onyenwe anyị.
12Nke a ga-abụrụ unu ihe ịrịbama, unu ga-ahụ nwata ọhụrụ e kechiri nʼakwa, dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri.”
13Na mberede, igwe ndị mmụọ ozi nke eluigwe pụtara soro mmụọ ozi a, bido na-eto Chineke na-asị,