47Nghọta na ọsịsa ya juru ndị niile nụrụ okwu ya anya.
48Mgbe ndị mụrụ ya hụrụ ya, ọ tụrụ ha nʼanya, ma nne ya sịrị ya, “Nwa m, gịnị mere i ji mesoo anyị mmeso dị otu a? Mụ na nna gị nọ na-achọgharị gị?”
49Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-achọ m? Unu amaghị na aghaghị m ịnọ nʼụlọ Nna m?”
50Ma ha aghọtaghị ihe ọ gwara ha.
51Mgbe ahụ, o sooro ha laghachi Nazaret ma na-erubekwara ha isi. Ma nne ya dobere ihe ndị a niile nʼobi ya.