4baptizim nke Jọn, o si nʼeluigwe ka o si nʼaka mmadụ?”
5Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị na o sitere nʼeluigwe, ọ ga-asị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’
6Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na, ‘o sitere nʼaka mmadụ,’ ndị mmadụ ga-atụ anyị nkume, nʼihi na ha niile kweere na Jọn bụ onye amụma.”
7Ya mere, ha zara, “Anyị amaghị ebe o si bịa.”
8Jisọs sịrị ha, “Enwekwaghị m ike ịgwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.”