Luk 22

Ha bidoro ịjụrịta onwe ha onye ọ bụ nʼetiti ha ga-eme nke a.

Luke 22:23 (UKJV) And they began to enquire among themselves, which of them it was that should do this thing.

21Ma lee, onye ahụ nke ga-arara m nye nọnyeere m, o sokwa m na-eri nri.

22Nwa nke Mmadụ na-aga ịnwụ dị ka e kpebiri ya, ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ a ga-esi nʼaka ya rara ya nye.”

23Ha bidoro ịjụrịta onwe ha onye ọ bụ nʼetiti ha ga-eme nke a.

24Ịrụ ụka malitere nʼetiti ha banyere onye nʼime ha ka a na-agụ na ọ dị ukwuu karịa ibe ya.

25Ma ọ sịrị ha, “Ndị eze ndị mba ọzọ na-eji aka ike na-achị ndị nọ nʼokpuru ha. Otu aka ahụkwa, a na-akpọ ndị na-achị achị enyi ndị mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.