32Ma ekpeelara m gị ekpere ka okwukwe gị ghara ịda. Mgbe ị kwudosiri ike, gbaakwa ụmụnna gị ume.”
33Ma ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ejikeere m isoro gị gaa mkpọrọ, ma sorokwa gị nwụọ.”
34Jisọs zara, “Agwa m gị Pita, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ, si na ị maghị onye m bụ.”
35Ọ gwara ha, “Mgbe m zipụrụ unu na mbụ sị unu ewerekwala ego, maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ, o nwere ihe kọrọ unu?” Ha sịrị, “O nweghị ihe kọrọ anyị.”
36Ọ sịrị ha, “Ugbu a, ọ bụrụ na i nwere akpa ego, were ya, ma werekwa akpa ije. Ọ bụrụkwa na i nweghị mma agha ree uwe mgbokwasị gị zụtara onwe gị otu.