Luk 22

Jisọs pụrụ gaa nʼUgwu Oliv dị ka ọ na-eme mgbe dum, ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya gaa.

Luke 22:39 (UKJV) And he came out, and went, as he was known, to the mount of Olives; and his disciples also followed him.

37Nʼihi na agwa m unu, na a ga-emejupụta ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ nʼime m, A gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu. Nʼezie, ihe e dere banyere m eruwela mgbe ọ ga-emezu.”

38Ha sịrị, “Onyenwe anyị, lee mma agha abụọ dị ebe a.” Ọ sịrị ha, “Nke ahụ ezuola.”

39Jisọs pụrụ gaa nʼUgwu Oliv dị ka ọ na-eme mgbe dum, ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya gaa.

40Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ sịrị ha, “Kpeenụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.”

41Ọ hapụrụ ha gaa ihe ha ka nzọ ụkwụ ole na ole nọrọ nʼebe ahụ gbuo ikpere nʼala kpee ekpere, sị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.