59Mgbe ihe dị ka otu awa gafere, onye ọzọ bịakwara kwusie okwu ike, “Nʼezie, nwoke a so ya nʼihi na ọ bụ onye Galili.”
60Pita sịrị, “Nwoke m, amaghị m ihe ị na-ekwu maka ya?” Dị ka ọ kpụ okwu ahụ nʼọnụ, oke ọkpa kwara akwa.
61Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tụgharịrị lee Pita anya. Pita chetakwara okwu Onyenwe anyị gwara ya nke bụ, “Tupu oke ọkpa akwa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
62Ma ọ pụrụ nʼezi gaa bee akwa na mwute.
63Ndị ahụ na-eche ya nche bidoro na-akwa ya emo na-etikwa ya ihe.