11Emesịa, Herọd na ndị agha ya jiri ya mee ihe ọchị, ma kwaakwa ya emo. Ha yikwasịrị ya uwe mwụda mara mma ma zighachikwara ya Pailet.
12Nʼụbọchị ahụ ka Herọd na Pailet ghọrọ enyi, maka nʼoge gara aga ha bụ ndị iro.
13Pailet kpọkọtara ndịisi nchụaja, na ndị ndu, na ndị mmadụ ndị ọzọ
14sị ha, “Unu kpọtaara m nwoke a dị ka otu onye nʼime ndị na-akpali ndị mmadụ inupu isi. Ajụọla m ya ajụjụ nʼihu unu ma achọpụtaghị m ihe ọbụla nke unu kwesiri iji boo ya ebubo.
15Ọ bụladị Herọd achọpụtaghị ihe ọjọọ ọbụla nʼaka ya, nke a mere o jiri kpụghachitere anyị ya. Leenụ, o nweghị ihe ọbụla o mere e kwesiri iji maa ya ikpe ọnwụ.