Luk 23

Mgbe ahụ, “ ‘ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Dakwasị anyị!” Sịkwa, ugwu nta, “Kpuchite anyị!” ’

Luke 23:30 (UKJV) Then shall they begin to say to the mountains, Fall on us; and to the hills, Cover us.

28Ma Jisọs tụgharịrị sị ha, “Ụmụada Jerusalem, unu eberela m akwa, kama beerenụ onwe unu na ụmụ unu.

29Nʼihi na oge na-abịa mgbe unu ga-asị, ‘Ngọzị na-adịrị ụmụ nwanyị aga, akpanwa ndị na-amụghị nwa, na ara ndị na-enweghị onye ṅụrụ ha.’

30Mgbe ahụ, “ ‘ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Dakwasị anyị!” Sịkwa, ugwu nta, “Kpuchite anyị!” ’

31Ya mere, ọ bụrụ na ha mee ọhịa otu a mgbe ahịhịa dị ndụ dị na ya, gịnị ga-emekwanụ mgbe ọ kpọrọ nkụ?”

32Ha dukwaara mmadụ abụọ bụ ndị ohi gaa igbu ha na ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.