40Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, “Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya.
41Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla.”
42Mgbe ahụ ọ sịrị, “Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị.”
43Ọ sịrị ya, “Nʼezie a agwa m gị, taa, ị ga-anọnyere m na paradaịs.”
44Mgbe ọ na-eru ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile ruo elekere atọ nke ehihie.