Luk 24

Ma ha ahụghị ahụ ya. Ha bịara kọrọ anyị na ha hụrụ ọhụ nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị gwara ha na ọ dị ndụ.

Luke 24:23 (UKJV) And when they found not his body, they came, saying, that they had also seen a vision of angels, which said that he was alive.

21Anyị nwererịị olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta Izrel. Nke ka nke, taa mere ya abalị atọ kemgbe ihe ndị a mere.

22Tụkwasị ihe ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị anyị mere ka anyị nwee ihe ịtụnanya. Ha gara nʼili ahụ nʼisi ụtụtụ a.

23Ma ha ahụghị ahụ ya. Ha bịara kọrọ anyị na ha hụrụ ọhụ nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị gwara ha na ọ dị ndụ.

24Ya mere ụfọdụ nʼime ndị otu anyị gara nʼili ahụ chọpụta na ihe niile ụmụ nwanyị a kwuru mere otu ahụ ha siri kwuo ya. Ma ha ahụkwaghị ya.”

25Ọ sịrị ha, “Unu bụ nnọọ ndị nzuzu! Leenụ ka o si siere unu ike ikwere ihe niile ndị amụma kwuru.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.