Luk 6

Dịka unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu, sitekwanụ otu a na-emeso ha.

Luke 6:31 (UKJV) And as all of you would that men should do to you, do all of you also to them likewise.

29Ọ bụrụ na onye ọbụla a maa gị ụra nʼotu ntị, tụgharịara ya ntị gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị.

30Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Ọ bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya.

31Dịka unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu, sitekwanụ otu a na-emeso ha.

32“Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ọbụladị ndị mmehie, ọ bụ ndị hụrụ ha nʼanya ka ha na-ahụkwa nʼanya.

33Ọ bụrụkwa naanị ndị na-emere unu ihe ọma ka unu na-emere ihe ọma, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-enyekwara ndị na-enyere ha aka aka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.