39Ọ tụkwaara ha ilu a, “Onye ìsì ọ pụrụ idu onye ìsì ibe ya? Ha abụọ ọ gaghị adaba nʼime olulu?
40Onye na-eso ụzọ onye ozizi anaghị akarị onye nkuzi ya, kama mgbe ọ mụtasịrị ọ ga-amata ihe dị ka onye nkuzi ya.
41“Gịnị mere i ji elee ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya, ma ị dịghị ahụta obodobo osisi dị gị onwe gị nʼanya?
42Ị ga-esi aṅaa sị nwanna gị, ‘Nwanna a, ka m wepụ gị ntakịrị ahịhịa dị gị nʼanya,’ mgbe gị onwe gị na-ahụghị obodobo osisi dị gị nʼanya? Gị onye ihu abụọ, buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ nke ọma wepụ ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya.
43“Ezi osisi adịghị amị mkpụrụ ọjọọ. Ọ dịkwaghị osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọma.