Luk 6

Ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ọrịa nʼụbọchị izuike.

Luke 6:7 (UKJV) And the scribes and Pharisees watched him, whether he would heal on the sabbath day; that they might find an accusation against him.

5Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Nwa nke Mmadụ bụ Onyenwe Ụbọchị Izuike.”

6Nʼụbọchị izuike ọzọ, ọ banyere nʼụlọ ekpere na-ezi ihe. Otu nwoke nọkwa nʼebe ahụ onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ.

7Ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ọrịa nʼụbọchị izuike.

8Ma ebe ọ maara ihe ha na-ezube nʼobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Bilie bịa guzoro nʼetiti ebe a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe ahụ.

9Mgbe ahụ Jisọs sịrị ha, “Ka m jụọ unu, gịnị ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike; ọ bụ ime ihe ọma ka ọ bụ ime ihe ọjọọ; ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.