19zie ha ka ha jekwuru Onyenwe anyị jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa. Ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?”
20Mgbe ụmụ nwoke ahụ bịakwutere ya, ha sịrị, “Jọn omee baptizim ziri anyị ka anyị jụọ gị sị, ‘Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?’ ”
21Mgbe ahụ ọ gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa, na nrịa nrịa dị iche iche, na mmụọ ọjọọ. O mekwara ka ọtụtụ ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ.
22Ọ zaghachiri ndị ozi ahụ sị, “Laghachinụ azụ gaa kọrọ Jọn ihe unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị kpuru ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije, ndị ekpenta ka a na-eme ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie, a na-ezisara ndị ogbenye oziọma.
23Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.”