Luk 7

Ma gịnị ka unu pụrụ ka unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, ana m a gwa unu, unu hụrụ onye karịrị onye amụma.

Luke 7:26 (UKJV) But what went all of you out in order to see? A prophet? Yea, I say unto you, and much more than a prophet.

24Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn pụrụ, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, “Gịnị ka unu gara nʼọzara ịhụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị?

25Ma gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? E e, ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa, ndị na-ebikwa nʼoke oriri na oke ọṅụṅụ bi nʼụlọeze.

26Ma gịnị ka unu pụrụ ka unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, ana m a gwa unu, unu hụrụ onye karịrị onye amụma.

27Ọ bụ onye a bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya sị, “ ‘Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’

28Agwa m unu, nʼetiti ndị nwanyị mụrụ, ọ dịghị onye dị ukwuu karịa Jọn, ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.