Luk 8

Mgbe Jisọs lọghachiri, igwe mmadụ nabatara ya nʼihi na ha niile na-eche ya.

Luke 8:40 (UKJV) And it came to pass, that, when Jesus was returned, the people gladly received him: for they were all waiting for him.

38Nwoke a e sitere nʼime ya chụpụ mmụọ ọjọọ rịọrọ ya ka o soro ya ma o zilagara ya, sị ya,

39“Laghachi nʼezinaụlọ gị kọọrọ ha ihe niile Chineke meere gị.” Nwoke ahụ lara, gbasaa akụkọ ihe Jisọs meere ya nʼobodo ahụ niile.

40Mgbe Jisọs lọghachiri, igwe mmadụ nabatara ya nʼihi na ha niile na-eche ya.

41Mgbe ahụ otu nwoke nke aha ya bụ Jairọs, onye bụ onyeisi nʼụlọ ekpere, bịara daa nʼala nʼụkwụ Jisọs na-arịọ ya ka ọ bịa nʼụlọ ya.

42Nʼihi na otu nwata nwanyị ọ mụtara naanị ya, nke gbara afọ iri na abụọ nọ nʼọnụ ọnwụ. Mgbe ọ na-aga, igwe mmadụ ahụ na-akpagbu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.