42Nʼihi na otu nwata nwanyị ọ mụtara naanị ya, nke gbara afọ iri na abụọ nọ nʼọnụ ọnwụ. Mgbe ọ na-aga, igwe mmadụ ahụ na-akpagbu ya.
43Ọ dị otu nwanyị nʼetiti ha nke nọrịị na-arịa ọrịa oruru ọbara afọ iri na abụọ, onye mefuru ihe niile o ji nʼaka ndị dibịa, ma ọ dịghị onye nwere ike ịgwọ ya.
44O sitere nʼazụ ya metụ ọnụ uwe ya aka. Ngwangwa, ọrịa oruru ọbara ahụ kwụsịkwara.
45Jisọs sịrị, “Onye metụrụ m aka?” Mgbe ọ na-enweghị onye pụtara kwuo sị na ọ bụ ya. Pita gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-adakwasịkwa gị.”
46Ma Jisọs sịrị, “Otu onye metụrụ m aka; amatara m na ike esitela nʼime m pụọ.”